14Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.
15O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.
16O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m.
17Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.
18Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”