Abụ Akwa 3

Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?

Lamentations 3:37 (UKJV) Who is he that says, and it comes to pass, when the Lord commands it not?

35ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka nʼihu Onye kachasị ihe niile elu,

36ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ. Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a?

37Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?

38Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa?

39Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.