19Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
20Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam? Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile?
21Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa; gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie,
22ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam na-eweso anyị iwe nke ukwu.