Levitikọs 11

Ebe ha bụ ihe na-asọ oyi nye unu, unu ekwesighị iri ha, unu ga-agụkwa ozu ha ka ihe na-adịghị ọcha.

Leviticus 11:11 (UKJV) They shall be even an abomination unto you; all of you shall not eat of their flesh, but all of you shall have their carcasses in abomination.

9“ ‘Nʼime ihe niile e kere eke dị ndụ biri na mmiri, maọbụ nʼiyi nta na nʼoke osimiri, unu nwere ike iri ụdị ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha.

10Ma unu ekwesighị iri ihe ọbụla nke na-enweghị ntu maọbụ akpịrịkpa, ma ha bụ anụ na-enupụta enupụta, maọbụ na ha so nʼanụ ndị ọzọ dị ndụ bi na mmiri, unu kwesiri ịsọ ha asọ.

11Ebe ha bụ ihe na-asọ oyi nye unu, unu ekwesighị iri ha, unu ga-agụkwa ozu ha ka ihe na-adịghị ọcha.

12Ihe ọbụla bi nʼime mmiri nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha, bụ nke unu ga-asọ asọ.

13“ ‘Ndị a bụ nnụnụ ndị unu ga-asọ asọ, nke unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha bụ ihe arụ a na-asọ oyi: ugo, udele na udele ojii,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.