24“ ‘Iri ha ga-eme ka unu rụọ arụọ. Onye ọbụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ site nʼoge o bitụrụ ha aka tutu ruo nʼabalị nke ụbọchị ahụ.
25Onye ọbụla metụrụ otu nʼime ozu ha aka ga-asakwa uwe ya, gụọkwa onwe ya dịka onye na-adịghị ọcha ruo uhuruchi.
26“ ‘Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya na-awasaghị abụọ, maọbụ nke na-adịghị atagharị nri ya ugboro abụọ, rụrụ arụ. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
27Nʼime anụmanụ niile na-aga ije nʼụkwụ anọ, anụmanụ ọbụla na-aga ije nʼọbụaka ya rụrụ arụ, unu agaghị eri ya. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
28Onye ọbụla ga-ebu ozu ya ga-asa uwe ya, bụrụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi, nʼihi na ọ bụ ihe rụrụ arụ nʼebe unu nọ.