29“ ‘Nʼime anụmanụ niile na-enupụta enupụta nʼala, anụmanụ ndị a bụ ndị rụrụ arụ: nkapi, na oke, na agụ iyi dịka ụdị ha si dị,
30na ọba mmiri, na ngwere aghụ, na ngwere, na ngwere uzuzu, na ogumagala.
31Nʼime ihe niile na-enupụta enupụta nʼala ndị a rụrụ arụ nʼebe unu nọ. Onye metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ tutu ruo uhuruchi ụbọchị ahụ.
32Ihe ọbụla nke ozu ha dakwasịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ, maọbụ osisi, maọbụ akwa, maọbụ akpụkpọ a na-akwa nʼala, maọbụ akpa, ihe ọbụla nke eji ya eme. A ga-etinye ya na mmiri, ọ ga-adịgide nʼime mmiri tutu ruo uhuruchi, mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha.
33Ọ bụrụ na otu nʼime ihe ndị a adanye nʼite aja, a ga-etiwa ite ahụ. Ihe niile dị nʼite ahụ abụrụla ihe rụrụ arụ.