34Ihe oriri ọbụla nke mmiri si nʼite a metụrụ abụrụla ihe rụrụ arụ. Mmiri ọṅụṅụ ọbụla dị nʼime ite ahụ rụkwara arụ.
35Ihe ọbụla ozu anụmanụ dị otu a dakwasịrị, maọbụ ite ọkụ eji eghe ihe, maọbụ ekwu a ga-etiwa ha. Nʼihi na ha bụ ihe rụrụ arụ, unu ga-agụ ha dịka ihe rụrụ arụ.
36Ọ bụrụkwa na ozu anụmanụ ahụ adaba nʼisi iyi, maọbụ nʼolulu mmiri, mmiri ahụ ga-adị ọcha, kama onye ga-emetụ anụ ahụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
37Ọ bụrụ na ozu anụ ahụ adakwasị mkpụrụ ubi a na-aga ịkụ nʼubi, ọ gaghị emerụ ha.
38Ma ọ bụrụ na e tinyere mmiri nʼelu mkpụrụ ọghịgha ndị ahụ, ozu adakwasị nʼelu ya, ha ga-abụ ihe rụrụ arụ.