2“Gwanụ ụmụ Izrel, sị, ‘Nʼime anụmanụ niile dị nʼụwa, ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri.
3Unu nwere ike iri anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa. nke na-atagharị ọnụ.
4“ ‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha.
5Ewi: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
6Ewi nkume: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.