Levitikọs 12

Onye nchụaja ga-anarakwa ha chee ha nʼihu Onyenwe anyị, chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie. Mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha site nʼịsọ ọbara ya. “ ‘Nke a bụ usoro iwu dịịrị nwanyị ọbụla mụrụ nwa nwoke, maọbụ nwa nwanyị.

Leviticus 12:7 (UKJV) Who shall offer it before the LORD, and make an atonement for her; and she shall be cleansed from the issue of her blood. This is the law for her that has born a male or a female.

5Mgbe nwanyị dị ime mụrụ nwa nwanyị, ọ ga-abụ onye nʼadịghị ọcha iri ụbọchị na anọ, dịka o si adị mgbe ọ nọ na nsọ ya. Ọ ga-echere tutu iri ụbọchị isii agwụsịa, ime ya ka ọ dị ọcha.

6“ ‘Mgbe ụbọchị ịdị ọcha ya zuru, ma ọ mụrụ nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị, ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute otu nwa atụrụ gbara otu afọ maka onyinye aja nsure ọkụ, na otu nwa kpalakwukwu maọbụ otu nduru maka onyinye aja mmehie.

7Onye nchụaja ga-anarakwa ha chee ha nʼihu Onyenwe anyị, chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie. Mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha site nʼịsọ ọbara ya. “ ‘Nke a bụ usoro iwu dịịrị nwanyị ọbụla mụrụ nwa nwoke, maọbụ nwa nwanyị.

8Ọ bụrụ na aka erughị ya iweta nwa atụrụ, ọ ga-eweta ụmụ kpalakwukwu abụọ, maọbụ ụmụ nduru abụọ. Otu ga-abụ maka aja nsure ọkụ, nke ọzọ ga-abụ maka aja mmehie. Onye nchụaja ga-ewere ha chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie, ka ọ dịkwa ọcha ọzọ.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.