1Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
2“Mgbe mmadụ hụrụ etuto, maọbụ ọnya, maọbụ ntụpọ na-eko eko nʼakpụkpọ anụ ahụ ya nke dị ka ihe ọrịa ekpenta na-eweta, a ga-eduru onye ahụ bịa nʼihu Erọn onye nchụaja maọbụ ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị nchụaja.
3Onye nchụaja ga-eleru ọrịa ahụ dị ya nʼahụ anya. Ọ bụrụ na ajị dị gburugburu ebe ahụ ebidola ịcha ọcha, ọ bụrụkwa na ebe ahụ mibara ime, ọ bụ ọrịa ekpenta. Mgbe onye nchụaja leruchara ya anya, ọ ga-ekwupụta na onye ahụ bụ onye rụrụ arụ.