4Ọ bụrụkwanụ na ajị dị gburugburu ebe ahụ dị ọcha, ma na ebe ahụ emighị emi karịa akụkụ ahụ ya ndị ọzọ, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ebe ọ ga-anọ naanị ya abalị asaa.
5Mgbe ụbọchị asaa gasịrị, onye nchụaja ga-ele ya ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ọnya ahụ alabeghị, na ọ nwekwaghị mgbanwe ọbụla, a ga-edebekwa ya abalị asaa ọzọ.
6Mgbe abalị asaa nke a gafekwara, onye nchụaja ga-elekwa ya ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ọ dịtụla ya mma, na ọnya ahụ agbasaghị nʼanụ ahụ ya, onye nchụaja ga-asị na ọ dị ọcha, nʼihi na ọ bụ naanị ọnya efu. Onye ahụ ga-asakwa uwe ya mmiri, mgbe ahụ dị ọcha.
7Ma ọ bụrụ na ọnya ahụ agbasaa nʼahụ ya mgbe o gosicharala onye nchụaja onwe ya maka nsacha ịdị ọcha, ọ ga-alaghachikwa azụ ga hụ onye nchụaja ahụ ọzọ.
8Onye nchụaja ga-eleru ya anya, ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ọnya ahụ na-agbasa, ọ ga-agụ onye ahụ dịka onye rụrụ arụ, ọ bụ ọrịa na-efe efe.