33Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
34“Mgbe unu banyere ala Kenan, bụ ala ahụ m na-enye unu, ọ bụrụ na o nwee ụlọ ọbụla m webatara ọrịa na-efe efe,
35onyenwe ụlọ ahụ ga-ejekwuru onye nchụaja sị ya, ‘Ahụla m ihe yiri ọrịa na-efe efe nʼụlọ m.’
36Onye nchụaja ahụ ga-enye iwu ka a kwapụsịa ihe niile dị nʼụlọ ahụ tupu ọ gaa lezie ụlọ ahụ anya, ka ihe niile dị nʼụlọ ahụ ghara ịbụ ihe rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na achọpụta ọrịa na-efe efe nʼụlọ ahụ. Mgbe a kwapụtasịrị ihe dị nʼụlọ ahụ, onye nchụaja ga-aga lee ụlọ ahụ.
37Ọ ga-ele ntụpọ dị nʼahụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ, maọbụ ọbara ọbara, ọ bụrụkwa na ha miri emi karịa aja ụlọ ahụ nʼile anya,