4onye nchụaja ga-enye iwu ka e weta nnụnụ abụọ dị ndụ, na ụfọdụ osisi sida, na eriri ogho uhie, na hisọp, maka onye ahụ a ga-emere mmemme ịdị ọcha.
5Onye nchụaja ga-enye iwu ka e gbuo otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ nʼelu mmiri e si nʼọdọ mmiri na-asọ asọ kute nke dị nʼime ite aja.
6Ọ ga-ewere nnụnụ nke ọzọ dị ndụ, ya na osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na hisọp ahụ, denye ha nʼime ọbara nnụnụ ahụ e gburu nʼelu mmiri ahụ.
7Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-efe ọbara ahụ ugboro asaa nʼahụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha site nʼọrịa ekpenta. Ọ ga-ekwupụtakwa na a gwọọla onye ahụ. Emesịa, ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ ka o felaa nʼọhịa.
8“Onye ahụ e mere ka ọ dị ọcha ga-asacha uwe ya, kpụchaa ntutu isi ya, saakwa ahụ ya. Mgbe ahụ, ọ ga-adị ọcha. Emesịa, ọ ga-esoro ndị mmadụ biri nʼobodo. Ma ọ gaghị abanye nʼụlọ nke aka ya tutu ụbọchị asaa agafee.