12“ ‘A ga-etiwa ite aja ọbụla onye ahụ metụrụ aka, jiri mmiri ṅachaa ihe osisi ọbụla o metụrụ aka.
13“ ‘Mgbe e mere ka onye ahụ bụrụ onye dị ọcha site nʼihe nsọpụta a, ọ ga-anọ ụbọchị asaa maka ịdị ọcha ya. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya nʼime mmiri na-asọ asọ tupu ọ bụrụ onye dị ọcha.
14Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ bịa nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, were ha nye onye nchụaja.
15Onye nchụaja ga-eji ha chụọrọ ya aja nʼebe ahụ. Otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ maka aja nsure ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri nwoke ahụ mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị nʼihi ihe ọsụsọ ahụ.
16“ ‘Nwoke ọbụla mkpụrụ nwa ya si ya nʼamụ pụọ, ga-asa ahụ ya nke ọma, bụrụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.