23Ọ bụrụkwa na ọ bụ ihe ndina ya, maọbụ ihe ọzọ nke o ji nọdụ ala, onye ọbụla metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
24“ ‘Nwoke dinakwuru nwanyị ọbara si nʼahụ ya na-apụta, ọ bụrụ na ọbara ahụ emetụ ya, ọ ga-abụ onye rụrụ arụ abalị asaa. Ihe ndina ọbụla o dinara nʼelu ya ga-abụ ihe rụrụ arụ.
25“ ‘Ọ bụrụ na ọbara si nwanyị nʼahụ na-apụta agafee oge o kwesiri ịkwụsị maọbụ na ọ pụtara nʼoge ọ na-ekwesighị ịpụta, nwanyị ahụ ga-anọgide bụrụ onye rụrụ arụ ogologo ụbọchị ndị ahụ niile ọbara ahụ si ya nʼahụ na-apụta.
26Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya mgbe ọbara si ya nʼahụ na-apụta, maọbụ ihe ọbụla ọ nọdụrụ ala nʼelu ya, ga-abụ ihe rụrụ arụ, dịka mgbe ọbara nke oge a kara aka.
27Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya maọbụ ihe ọ nọdụrụ ala nʼelu ya aka, ga-arụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asakwa uwe ya na ahụ ya mmiri.