27Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya maọbụ ihe ọ nọdụrụ ala nʼelu ya aka, ga-arụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asakwa uwe ya na ahụ ya mmiri.
28“ ‘Mgbe ọbara ahụ kwụsịrị, ọ ga-agụ ụbọchị asaa site nʼoge ọ kwụsịrị. Mgbe abalị asaa ahụ zuru, ọ ga-abụ onye dị ọcha.
29Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
30Onye nchụaja ahụ ga-eji otu chụọrọ ya aja mmehie, werekwa nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi adịghị ọcha nke ihe ọsụsọ ya.
31“ ‘Unu ga-ekewapụ ụmụ Izrel site nʼihe ndị ahụ na-emerụ ha, ka ha ghara ịnwụ nʼọnọdụ adịghị ọcha ha nʼihi imerụ ụlọ nzute m, nke dị nʼetiti ha.’ ”