20“Mgbe Erọn chụchara aja mkpuchi mmehie maka Ebe ahụ Kachasị Nsọ, ụlọ nzute, nakwa ebe ịchụ aja, ọ ga-akpụbata mkpi ahụ e debere ndụ.
21Ọ ga-ebikwasị aka ya abụọ nʼisi ya, kwupụta ajọ omume na nnupu isi ụmụ Izrel niile, mmehie ha niile, bokwasị ha mkpi ahụ nʼisi. Ọ ga-ezipụ mkpi ahụ pụọ nʼime ọzara site nʼaka onye ahụ a họpụtara ime nke a.
22Nʼụzọ dị otu a, mkpi ahụ ga-eburu mmehie ndị ahụ niile baa nʼebe mmadụ ọbụla na-ebighị. Nwoke ahụ ga-ahapụkwa ya nʼọzara.
23“Mgbe ahụ, Erọn ga-aba nʼime ụlọ nzute ahụ, yipụ uwe akwa ọcha ndị nchụaja ahụ niile o yi nʼahụ ya tupu ọ banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ. Ọ ga-awụsa ha nʼebe ahụ.
24Ọ ga-eji mmiri saa ahụ ya nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, yirikwa uwe efu ya. Mgbe ahụ, ọ ga-apụta bịa chụọ aja nsure ọkụ nke onwe ya, na aja nsure ọkụ nke ndị ahụ, maka ikpuchiri onwe ya, na ikpuchikwara ndị ahụ mmehie ha.