Levitikọs 17

“Gwa Erọn, na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.

Leviticus 17:2 (UKJV) Speak unto Aaron, and unto his sons, and unto all the children of Israel, and say unto them; This is the thing which the LORD has commanded, saying,

1Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

2“Gwa Erọn, na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.

3Onye ọbụla bụ onye ụlọ Izrel gbuo ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu nʼogige ebe obibi, maọbụ nʼazụ ebe obibi,

4ma o wetaghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute iche ya dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị, a ga-agụ onye ahụ dịka onye ikpe iwufu ọbara mara. Ọ wụfuola ọbara, nʼihi ya, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.