3Onye ọbụla bụ onye ụlọ Izrel gbuo ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu nʼogige ebe obibi, maọbụ nʼazụ ebe obibi,
4ma o wetaghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute iche ya dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị, a ga-agụ onye ahụ dịka onye ikpe iwufu ọbara mara. Ọ wụfuola ọbara, nʼihi ya, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya.
5Ihe e ji nye iwu a bụ ka ụmụ Izrel wetara Onyenwe anyị aja niile ha na-achụ ugbu a na mbara ezi ọbụla. Ha kwesiri iwetara ya Onyenwe anyị site nʼaka onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka o jiri ya chụọrọ ha aja udo.
6Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-efesa ọbara ahụ nʼebe ịchụ aja dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, kpọọkwa abụba ya ọkụ, ka ọ bụrụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.
7O kwesikwaghị ka ndị Izrel chụọ aja ha ọzọ na mbara ezi nye arụsị ewu ndị ha na-akpọ isiala nye. Iwu a ga-adịgide nye ha na ụmụ ha niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.’