Levitikọs 17

“Gwa ha, ‘Onye Izrel ọbụla, maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu, nke ga-achụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ọzọ,

Leviticus 17:8 (UKJV) And you shall say unto them, Whatsoever man there be of the house of Israel, or of the strangers which sojourn among you, that offers a burnt offering or sacrifice,

6Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-efesa ọbara ahụ nʼebe ịchụ aja dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, kpọọkwa abụba ya ọkụ, ka ọ bụrụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.

7O kwesikwaghị ka ndị Izrel chụọ aja ha ọzọ na mbara ezi nye arụsị ewu ndị ha na-akpọ isiala nye. Iwu a ga-adịgide nye ha na ụmụ ha niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.’

8“Gwa ha, ‘Onye Izrel ọbụla, maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu, nke ga-achụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ọzọ,

9ma o webataghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebe a ga-achụrụ ya Onyenwe anyị, ka a ga-ewezuga site nʼetiti ndị ya.

10“ ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti ha, nke riri ọbara ọbụla ka m ga-eche ihu m megide. A ga-ewezuga ya site nʼetiti ndị m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.