23“ ‘Gị na anụmanụ ọbụla edinakwala, site otu a merụọ onwe gị. Nwanyị agakwaghị ewere onwe ya nye ka ya na oke anụmanụ nwee mmekọrịta, arụ a na-adịghị eme eme ka ọ bụ.
24“ ‘Unu emerụkwala onwe unu site na-ime ihe ndị a, nʼihi na ihe ndị a bụ ihe mba ndị ahụ na-eme. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ga-eji chụpụ ha site nʼala ahụ m ga-enye unu.
25Ọ bụladị ala ahụ niile ghọrọ ihe rụrụ arụ site nʼomume ndị a. Ọ bụ nke a mere m ji ata ndị bi nʼime ya ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ala ahụ meghere ọnụ ya gbọpụta ndị bi nʼime ya.
26Unu ga-edebe iwu m na ụkpụrụ m ndị a niile. Unu emekwala ihe arụ ndị a, ma ndị amụrụ nʼala ma ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.
27Ala m na-aga inye unu rụrụ arụ nʼihi na ndị bi nʼime ya na-eme omume ndị a rụrụ arụ.