15“ ‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ.
16“ ‘Unu ejegharịla na-agbasa okwu nkwujọ nʼetiti ndị mmadụ. “ ‘Emela ihe ọbụla ga-ebutere onye agbataobi gị ọnwụ. Abụ m Onyenwe anyị.
17“ ‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya.
18“ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.
19“ ‘Unu ga-edebe iwu m niile. “ ‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “ ‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “ ‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ.