1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2“Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha: ‘Dịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, dị nsọ.
3“ ‘Onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịsọpụrụ nne na nna ya, debekwa iwu m nyere maka ụbọchị izuike, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
4“ ‘Unu akpọla isiala nye arụsị, unu emekwarala onwe unu chi ndị e ji ọla kpụọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
5“ ‘Mgbe unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja udo, soronụ ụkpụrụ m nyere unu chụọ ya, ka m nabata ya.