30“ ‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị izuike m. Sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
31“ ‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
32“ ‘Bilienụ ọtọ nʼihu okenye, sọpụrụnụ ndị okenye, ma tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
33“ ‘Mgbe onye ọbịa soro unu biri nʼala unu, unu emejọla ya.
34Mesonụ onye ọbịa bi nʼetiti unu mmeso dịka ọ bụ otu nʼime ndị amụrụ nʼala. Hụnụ ha nʼanya dịka unu si hụ onwe unu, nʼihi na o nwere oge unu bụ ọbịa nʼala Ijipt. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.