34Mesonụ onye ọbịa bi nʼetiti unu mmeso dịka ọ bụ otu nʼime ndị amụrụ nʼala. Hụnụ ha nʼanya dịka unu si hụ onwe unu, nʼihi na o nwere oge unu bụ ọbịa nʼala Ijipt. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
35“ ‘Unu ejila ihe ọtụtụ aghụghọ mgbe unu na-atụ ihe dị ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu,
36Jirinụ ezi ihe ọtụtụ tụọ ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu.
37“ ‘Debenụ ụkpụrụ m niile, na iwu m niile, gbasoonụ ha. Abụ m Onyenwe anyị.’ ”