25“ ‘Unu aghaghị ịkpa oke nʼetiti anụmanụ ndị dị ọcha iri eri, na anụmanụ ndị na-adịghị ọcha, na nʼetiti anụ ufe dị ọcha iri eri na ndị rụrụ arụ. Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ maọbụ anụ ufe, maọbụ ihe ọzọ na-akpụgharị nʼala, ndị ahụ m kewapụrụ iche dịka ihe rụrụ arụ.
26Unu ga-adị nsọ nye m, nʼihi na mụ, bụ Onyenwe anyị, dị nsọ. Ekewapụtala m unu, doo unu iche, site nʼetiti ndị mba ọzọ niile, ka unu bụrụ nke m.
27“ ‘A ga-eji nkume tugbuo nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nke na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa nọ nʼetiti unu ka ọ nwụọ. Ọbara ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ”