Levitikọs 23

Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

Leviticus 23:26 (UKJV) And the LORD spoke unto Moses, saying,

24“Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Ụbọchị mbụ nke ọnwa nke asaa ga-abụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nke a ga-eji opi na-ada oke ụda cheta.

25Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, kama unu ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.’ ”

26Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

27“Ụbọchị nke iri nke ọnwa asaa a bụ ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ọ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nye unu. Unu ga-ata onwe unu ahụhụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ.

28Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ nʼihi na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịchụ aja mkpuchi mmehie unu nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.