28Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ nʼihi na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịchụ aja mkpuchi mmehie unu nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu.
29Onye ọbụla na-ejighị ụbọchị ahụ weda onwe ya nʼala ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.
30Aga m ebibikwa onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị ahụ.
31Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide nye unu niile site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
32Ọ ga-abụ ụbọchị izuike zuruoke nye unu, unu ga-ewedakwa onwe unu nʼala. Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa ahụ, site nʼuhuruchi ruo nʼuhuruchi nke na-esote ya, unu ga-edebe izuike unu.”