5Nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa ahụ, nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ka Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị ga-adị.
6Mmemme achịcha na-ekoghị eko Onyenwe anyị ka unu ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa ahụ. Abalị asaa ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
7Nʼụbọchị mbụ nke mmemme a, unu ga-enwe mkpọkọta dị nsọ, ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-arụ ọrụ ọbụla.
8Unu ga-eweta aja e sitere nʼọkụ chụọ nye Onyenwe anyị. Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.’ ”
9Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya,