19Onye ọbụla merụrụ mmadụ ibe ya ahụ, a ga-emerụkwa onye ahụ ahụ nʼebe o merụrụ ibe ya ahụ.
20Onye tijiri mmadụ ọkpụkpụ, a ga-etiji ọkpụkpụ nke ya. Anya ga-alara anya, eze ga-alakwara eze. Otu e si merụọ mmadụ ahụ, ka a ga-esi merụọkwa onye merụrụ ya ahụ.
21Onye ọbụla gburu anụ ụlọ onye ọzọ, ga-akwụ ụgwọ ya. Ma a ga-egbu onye ọbụla gburu mmadụ.
22Unu ga-enwe otu iwu nke ga-adị nye ndị amụrụ nʼala, dịkwara ndị ọbịa niile. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”
23Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Izrel okwu, nʼihi ya ha dọkpụụrụ onye nkwulu ahụ pụọ nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya nʼebe ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.