10Doonụ afọ nke iri ise ahụ nsọ, kwusaakwa inwere onwe nye mmadụ niile nʼala ahụ niile. Afọ ahụ ga-abụ afọ inwere onwe nye unu. Onye ọbụla nʼime unu ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ezinaụlọ ya, onye ọbụla kwa ga-alaghachi nʼagbụrụ ya.
11Afọ nke iri ise bụ afọ inwere onwe nye unu. A gaghị akụ ihe ọbụla nʼubi, a gakwaghị ewe ihe ubi ọbụla puputara nʼonwe ya, maọbụ mkpụrụ osisi vaịnị mịrị nʼonwe ya.
12Ọ bụ afọ inwere onwe, bụrụkwa afọ dị nsọ nye unu, nke onye ọbụla ga-eri naanị ihe e wetara nʼubi.
13“ ‘Onye ọbụla ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ya, nʼafọ inwere onwe a.
14“ ‘Ọ bụrụ na i resiri onye agbataobi gị ala, maọbụ na o nwere nke ọ zụrụ site nʼaka gị, unu aghọgbula ibe unu.