43A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ. Tụọnụ egwu Chineke unu.
44“ ‘Ma unu nwere ike gbara ndị ohu nwoke maọbụ nwanyị site nʼetiti ndị mba ọzọ niile bi nʼakụkụ unu. Unu nwere ike site nʼebe ahụ zụta ndị ohu.
45Unu nwere ike ịzụ ndị ohu site nʼetiti ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, maọbụ site nʼetiti ndị agbụrụ ha a mụrụ nʼala Izrel. Ndị dị otu a ga-abụkwa ihe onwunwe unu.
46Unu nwere ike kenye ha ụmụ unu dịka ihe nketa, ma mee ha ndị ohu unu ụbọchị ndụ ha niile. Ma unu agaghị eji aka ike chịa onye Izrel ibe unu.
47“ ‘Ọ bụrụ na onye ọbịa bi nʼetiti unu aghọọ ọgaranya, ma otu nʼime ụmụnna unu adaa ogbenye were onwe ya resi onye ọbịa ahụ bi nʼetiti unu, maọbụ were onwe ya resi nwanna ndị ikwu onye ọbịa ahụ,