44Ma ewezugakwa ihe ndị a niile, agaghị m ajụ ha, maọbụ sọọ ha oyi, ruo na ibibi ha kpamkpam mgbe ahụ ha nọ nʼala ndị iro ha. Agakwaghị m emebi ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke ha.
45Kama nʼihi ha, aga m echeta ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, ịbụ Chineke ha, ndị ahụ m kpọpụtara site nʼala Ijipt nʼihu mba niile. Abụ m Onyenwe anyị.’ ”
46Ndị a bụ iwu, na ụkpụrụ na ndụmọdụ Onyenwe anyị guzobere nʼugwu Saịnaị, nʼetiti ya onwe ya, na ụmụ Izrel, site nʼaka Mosis.