31Onye ọbụla chọrọ ịgbara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe ubi ya aghaghị ịkwụ ọnụahịa ya, tụkwasị ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa e kwesiri ire ya.
32Otu ụzọ nʼụzọ iri nke igwe ehi na atụrụ niile, anụ nke iri ọbụla nke na-agabiga nʼokpuru mkpanaka onye ọzụzụ atụrụ mgbe a na-agụ ha ọnụ, ga-abụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị.
33A gaghị ahọ anụ ụlọ a na-enye Onyenwe anyị ahọ, ile ma ha dị mma, maọbụ na ha dị njọ. A gaghị agbanwekwa ha. Ọ bụrụ na a gbanwee ha, ndị e ji gbanwee ha na ndị a na-achọ ịgbanwe ga-aghọ ihe dị nsọ, a gaghị agbarakwa ha.’ ”
34Ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis nʼugwu Saịnaị ka ọ nye ụmụ Izrel.