Levitikọs 4

Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

Leviticus 4:1 (UKJV) And the LORD spoke unto Moses, saying,

1Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

2“Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, megide ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu:

3“ ‘Ọ bụrụ na onye nchụaja e tere mmanụ emehie na-amaghị ama, si otu a weta ikpe ọmụma nʼisi ọha mmadụ. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị otu oke ehi na-enweghị ntụpọ dịka aja mmehie, nʼihi mmehie ahụ o mere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.