24Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi mkpi ahụ. Gbuo ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ aja mmehie.
25Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya tee ya nʼelu mpi ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Nke fọdụrụ ka ọ ga-awụpụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja.
26Ọ ga-akpọ abụba ya niile ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka o si kpọọ abụba anụ e ji chụọ aja udo ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri onyeisi ahụ mmehie ya. A ga-agbaghara ya.
27“ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼetiti ndị obodo ahụ emehie na-amaghị ama, mee ihe megidere ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha,
28ọ bụrụkwa na-amata mmehie ha mere, ha ga-eweta nne ewu na-enweghị ntụpọ dịka onyinye nʼihi mmehie ya.