33Ọ ga-eweta ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ebikwasị ya aka nʼisi, gbuo ya nʼebe ahụ, ka ọ bụrụ aja mmehie ya.
34Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara anụ aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya, tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja.
35Ha ga-ewepụ abụba ya niile, dịka a na-eme nʼatụrụ aja udo. Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ a chụrụ nye Onyenwe anyị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie nʼihi iwu ha dara. A ga-agbaghara ha mmehie ha.