1Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2“Ọ bụrụ na onye ọbụla emehie bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, site nʼiduhie onye agbataobi ya banyere ihe e tinyere ya nʼaka idebe, maọbụ izunarị mmadụ ihe, maọbụ iji aghụghọ nara mmadụ ibe ya ihe;
3maọbụ site nʼijide ihe furu efu nke ọ chọtara ghaa ụgha banyere ya. Ma ọ bụrụ na ha a ṅụọ iyi na ha ejighị ya, maọbụ gbasara ụdị mmehie mmadụ pụrụ ime.