Levitikọs 7

“ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara aja udo nke mmadụ ọbụla nwere ike chụọrọ Onyenwe anyị nʼaja:

Leviticus 7:11 (UKJV) And this is the law of the sacrifice of peace offerings, which he shall offer unto the LORD.

9A ga-ebunye onye nchụaja chụrụ aja mkpụrụ ọka nke e ji ụtụ ọka chụọ, ụtụ ọka fọdụrụ. Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼaja achịcha ọbụla a nụrụ anụ, maọbụ nke e siri esi, maọbụ nke e ghere eghe. Ihe ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ.

10Aja mkpụrụ ọka ọbụla, ma nke e tinyere mmanụ, ma nke a na-etinyeghị mmanụ, nke fọdụrụ ga-abụ nke ụmụ ndị ikom Erọn.

11“ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara aja udo nke mmadụ ọbụla nwere ike chụọrọ Onyenwe anyị nʼaja:

12“ ‘Ọ bụrụ na ha enye ya dịka aja ekele, tinyere aja ekele a ha ga-eweta ogbe achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke a gwakọtara ya na mmanụ oliv, na mbadamba achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke e tere mmanụ nʼelu ya, nakwa achịcha e ji ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara ya na mmanụ nʼime ya.

13Ọ ga-ewetakwa onyinye achịcha ọzọ nke e ji ihe na-eko achịcha, ya bụ, yiist mee, tinyere aja udo nke ekele ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.