29“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla wetaara Onyenwe anyị onyinye aja udo aghaghị iweta ụfọdụ nʼime onyinye ahụ dịka onyinye pụrụ iche nye Onyenwe anyị.
30Ha ga-eji aka ha chee onyinye nsure ọkụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-eweta abụba ahụ, ya na obi anụ, fufee obi anụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
31Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja, ma obi anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị ikom.
32Unu ga-enye onye nchụaja apata aka nri nke anụ aja udo ahụ, dịka onyinye.
33Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya.