33Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya.
34Site nʼonyinye ụmụ Izrel na-enye nʼoge aja udo, ewerela m obi anụ ahụ a na-efufe efufe, na apata anụ a na-eche nʼihu m nye Erọn, onye nchụaja na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ oke ruuru ha mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-achụ aja udo.’ ”
35Nke a bụ akụkụ anụ ahụ e ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke e nyekwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼụbọchị ahụ e chere ha nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi dịka ndị nchụaja.
36Nʼihi na nʼụbọchị ahụ e tere ha mmanụ ka Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel iwu sị ha nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom oke ndị a oge niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
37Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na aja mmehie, na aja ikpe ọmụma, na onyinye ido nsọ, na aja udo.