36Nʼihi na nʼụbọchị ahụ e tere ha mmanụ ka Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel iwu sị ha nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom oke ndị a oge niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
37Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na aja mmehie, na aja ikpe ọmụma, na onyinye ido nsọ, na aja udo.
38Onyenwe anyị nyere Mosis iwu ndị a nʼugwu Saịnaị nʼụbọchị ahụ o nyere ụmụ Izrel iwu sị ha, wetara Onyenwe anyị onyinye nʼọzara Saịnaị.