Levitikọs 8

Mosis wekwara abụba niile dị gburugburu ihe dị nʼime afọ ehi ahụ, mba-umeju nke umeju ya, akụrụ abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja.

Leviticus 8:16 (UKJV) And he took all the fat that was upon the inwards, and the lobe above the liver, and the two kidneys, and their fat, and Moses burned it upon the altar.

14Ọ kpụtara oke ehi e ji achụ aja mmehie, mee ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya.

15Mosis gburu oke ehi ahụ, were ụfọdụ nʼime ọbara ahụ, jiri mkpịsịaka ya rụta ọbara tee na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja, ido ebe ịchụ aja ahụ nsọ. Ọ wụpụrụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja ahụ. Otu a ka o si doo ya nsọ, ikpuchiri ya mmehie.

16Mosis wekwara abụba niile dị gburugburu ihe dị nʼime afọ ehi ahụ, mba-umeju nke umeju ya, akụrụ abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja.

17Ma oke ehi ahụ, akpụkpọ ya, anụ ya na mgbịrị afọ ya, ka ọ kpọrọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

18O weere ebule ahụ, chee nʼihu Onyenwe anyị, dịka aja nsure ọkụ. Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.