Levitikọs 8

Ọ bọwasịrị ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, kpọọ isi ya, iberibe anụ ya na abụba ya ọkụ.

Leviticus 8:20 (UKJV) And he cut the ram into pieces; and Moses burnt the head, and the pieces, and the fat.

18O weere ebule ahụ, chee nʼihu Onyenwe anyị, dịka aja nsure ọkụ. Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya.

19Mgbe ahụ, Mosis gburu ebule ahụ, fesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.

20Ọ bọwasịrị ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, kpọọ isi ya, iberibe anụ ya na abụba ya ọkụ.

21Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya na ụkwụ ya niile mmiri, kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼebe ịchụ aja. Nʼihi na ọ bụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma, nʼihi na ọ bụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

22O kpụpụtara ebule nke ọzọ, bụ ebule nke ido nsọ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.