1Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2“Kpọta Erọn na ụmụ ya ndị ikom, chịtakwa uwe ha, weta mmanụ nsọ, oke ehi nke aja mmehie na ebule abụọ ahụ, na nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
3Kpọkọtaa ọgbakọ ụmụ Izrel niile ka ha bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.”
4Mosis mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọgbakọ ụmụ Izrel zukọtara nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
5Mosis gwara ọgbakọ ahụ sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka e mee.”