8Erọn bịara nso nʼebe ịchụ aja, gbuo nwa ehi ahụ ka ọ bụrụ aja mmehie nke ya.
9Ụmụ Erọn buteere ya ọbara ehi ahụ. O tinyere mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja. Ọ wụrụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja ahụ.
10Ọ kpọrọ abụba ya, na akụrụ ya abụọ, na ihe kpuchiri umeju si nʼaja mmehie ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka Onyenwe anyị nyere Mosis iwu.
11Ma anụ ahụ ya, na akpụkpọ ya, ka ọ kpọrọ ọkụ nʼazụ ebe obibi.
12Emesịa, o gburu anụ e wetara maka aja nsure ọkụ ahụ. Ụmụ ya ndị ikom nyere ya ọbara anụ ahụ, nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja.