3Ọ gwakwara ụmụ Izrel sị ha, ‘Họrọnụ mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie, na nwa ehi, na nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ, ndị gbara naanị otu afọ, a ga-eji chụọ aja nsure ọkụ,
4na ehi, na ebule a ga-eji chụọ aja udo nʼihu Onyenwe anyị, tinyere mkpụrụ ọka a gwara mmanụ. Nʼihi na taa ka Onyenwe anyị ga-eme ka unu hụ ya anya.’ ”
5Ha wetara ihe ndị a niile bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute dịka Mosis nyere nʼiwu. Ọgbakọ ụmụ Izrel niile bịara nso guzo nʼihu Onyenwe anyị.
6Mgbe ahụ, Mosis sịrị ha, “Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị nyere unu nʼiwu idebe, ka ebube ya si otu a pụta ìhè nʼihu unu.”
7Mosis sịrị Erọn, “Bịa nso nʼebe ịchụ aja. Chụọ aja mmehie, na aja nsure ọkụ nke a ga-eji kpuchie mmehie gị na mmehie ndị ahụ niile. Chụọ aja onyinye dịrị ndị ahụ, maka ikpuchiri ha mmehie ha, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”