1Ebe ọ bụ nʼọtụtụ mmadụ agbalịala otu ha nwere ike i detu nʼusoro ihe niile mezuru nʼetiti anyị.
2Dị ka e nyefere ha nʼaka anyị idebe bụ ndị ahụ sitere na malite jiri anya ha hụ ihe niile, ndị jikwa okwu a eje ozi.
3Ekpebikwara m, ebe mụ onwe m nyocharala ihe niile nke ọma site na mmalite, ka m dere gị ihe niile nʼusoro, Tiofilọs, gị onye dị elu a na-asọpụrụ.
4Nke a ga-eme ka ị mata nke bụ eziokwu banyere ihe ndị ahụ e ziri gị.