Luk 1

Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?”

Luke 1:34 (UKJV) Then said Mary unto the angel, How shall this be, seeing I know not a man?

32Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid.

33Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.”

34Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?”

35Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke.

36Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.