44Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ.
45Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.”
46Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu
47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m,
48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi.